Native Bible

Obadiah 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha.

Obadiah 1:9 in English

Obadiah 1:9 · Berean Standard Bible

Then your mighty men, O Teman, will be terrified, so that everyone in the mountains of Esau will be cut down in the slaughter.

Context

7Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya. 8“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ? 9Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri. Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile, ka a ga-egbuda nʼagha. 10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.