Ọbadaya 1:10
Obadiah 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
Obadiah 1:10 in English
Obadiah 1:10 · Berean Standard Bible
Because of the violence against your brother Jacob, you will be covered with shame and cut off forever.
Context
8“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi,
bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ? 9Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri.
Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile,
ka a ga-egbuda nʼagha. 10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.
Ihere ga-ekpuchi gị;
a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị,
na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya,
sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee
fee nza iji kerie Jerusalem.
Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha. 12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya
nʼụbọchị nsogbu ya,
ị garaghị aṅụ ndị Juda
nʼụbọchị ahụ e bibiri ha.
Ị garaghị anyara ha isi
nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.