Ọbadaya 1:8
Obadiah 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi, bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
Obadiah 1:8 in English
Obadiah 1:8 · Berean Standard Bible
In that day, declares the LORD, will I not destroy the wise men of Edom and the men of understanding in the mountains of Esau?
Context
6Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya,
lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo! 7Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị,
ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala;
ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu,
ma ị gaghị achọpụta ya. 8“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi,
bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ? 9Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri.
Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile,
ka a ga-egbuda nʼagha. 10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.
Ihere ga-ekpuchi gị;
a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.