Ọbadaya 1:6
Obadiah 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!
Obadiah 1:6 in English
Obadiah 1:6 · Berean Standard Bible
But how Esau will be pillaged, his hidden treasures sought out!
Context
4A sịkwarị na i felie elu dịka ugo,
ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando,
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 5“Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị,
e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị,
lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị!
Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru?
Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? 6Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya,
lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo! 7Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị,
ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala;
ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu,
ma ị gaghị achọpụta ya. 8“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi,
bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.