Native Bible

Obadiah 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.

Obadiah 1:12 in English

Obadiah 1:12 · Berean Standard Bible

But you should not gloat in that day, your brother’s day of misfortune, nor rejoice over the people of Judah in the day of their destruction, nor boast proudly * in the day of their distress.

Context

10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike. Ihere ga-ekpuchi gị; a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha. 12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya nʼụbọchị nsogbu ya, ị garaghị aṅụ ndị Juda nʼụbọchị ahụ e bibiri ha. Ị garaghị anyara ha isi nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu. 13I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha. 14I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ, maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha, nʼụbọchị nsogbu ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.