Ọbadaya 1:13
Obadiah 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, nʼụbọchị ha nọ na nsogbu, maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha nʼụbọchị nsogbu ha.
Obadiah 1:13 in English
Obadiah 1:13 · Berean Standard Bible
You should not enter the gate of My people in the day of their disaster, nor gloat over their affliction in the day of their disaster, nor loot their wealth in the day of their disaster.
Context
11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị,
na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya,
sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee
fee nza iji kerie Jerusalem.
Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha. 12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya
nʼụbọchị nsogbu ya,
ị garaghị aṅụ ndị Juda
nʼụbọchị ahụ e bibiri ha.
Ị garaghị anyara ha isi
nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu. 13I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije
nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,
o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha,
nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,
maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha
nʼụbọchị nsogbu ha. 14I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ
igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ,
maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha,
nʼụbọchị nsogbu ha. 15“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso
nye mba niile.
Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị;
ihe i metara ga-adị gị nʼisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.