Nehum 1:5
Nahum 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
Nahum 1:5 in English
Nahum 1:5 · Berean Standard Bible
The mountains quake before Him, and the hills melt away; the earth trembles at His presence— the world and all its dwellers.
Context
3Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu,
Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ.
Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe,
igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya. 4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,
o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.
Bashan na Kamel na-akpọnwụ,
otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị. 5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,
ugwu nta niile na-agbazekwa,
elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,
ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya. 6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?
Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?
A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,
e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya. 7Onyenwe anyị dị mma.
Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.
Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.