Native Bible

Nahum 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.

Nahum 1:4 in English

Nahum 1:4 · Berean Standard Bible

He rebukes the sea and dries it up; He makes all the rivers run dry. Bashan and Carmel wither, and the flower of Lebanon wilts.

Context

2Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya. 3Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya. 4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị. 5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya. 6Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.