Nehum 1:4
Nahum 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
Nahum 1:4 in English
Nahum 1:4 · Berean Standard Bible
He rebukes the sea and dries it up; He makes all the rivers run dry. Bashan and Carmel wither, and the flower of Lebanon wilts.
Context
2Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ.
Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi.
Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya,
oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya. 3Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu,
Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ.
Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe,
igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya. 4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,
o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.
Bashan na Kamel na-akpọnwụ,
otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị. 5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,
ugwu nta niile na-agbazekwa,
elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,
ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya. 6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?
Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?
A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,
e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.