Nehum 1:2
Nahum 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
Nahum 1:2 in English
Nahum 1:2 · Berean Standard Bible
The LORD is a jealous and avenging God; the LORD is avenging and full of wrath. The LORD takes vengeance on His foes and reserves wrath for His enemies.
Context
1Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh. 2Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ.
Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi.
Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya,
oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya. 3Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu,
Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ.
Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe,
igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya. 4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,
o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.
Bashan na Kamel na-akpọnwụ,
otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.