Nehum 1:6
Nahum 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
Nahum 1:6 in English
Nahum 1:6 · Berean Standard Bible
Who can withstand His indignation? Who can endure His burning anger? His wrath is poured out like fire; even rocks are shattered before Him.
Context
4Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa,
o mekwaala ka osimiri niile takọrọ.
Bashan na Kamel na-akpọnwụ,
otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị. 5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,
ugwu nta niile na-agbazekwa,
elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,
ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya. 6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?
Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?
A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,
e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya. 7Onyenwe anyị dị mma.
Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.
Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi, 8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu
gbuo ndị iro ya* niile,
ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.