Native Bible

Nahum 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya* niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.

Nahum 1:8 in English

Nahum 1:8 · Berean Standard Bible

But with an overwhelming flood He will make an end of Nineveh * and pursue His enemies into darkness.

Context

6Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya. 7Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi, 8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya* niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị. 9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ. 10Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.