Nehum 1:8
Nahum 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya* niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
Nahum 1:8 in English
Nahum 1:8 · Berean Standard Bible
But with an overwhelming flood He will make an end of Nineveh * and pursue His enemies into darkness.
Context
6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?
Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?
A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,
e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya. 7Onyenwe anyị dị mma.
Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.
Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi, 8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu
gbuo ndị iro ya* niile,
ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị. 9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị
ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe;
nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ. 10Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu,
ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu,
ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.