Nehum 1:7
Nahum 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
Nahum 1:7 in English
Nahum 1:7 · Berean Standard Bible
The LORD is good, a stronghold in the day of distress; He cares for those who trust in Him.
Context
5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ,
ugwu nta niile na-agbazekwa,
elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya,
ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya. 6Onye ga-eguzogide oke iwe ya?
Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ?
A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ,
e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya. 7Onyenwe anyị dị mma.
Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.
Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi, 8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu
gbuo ndị iro ya* niile,
ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị. 9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị
ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe;
nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.