Native Bible

Nahum 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

Nahum 1:7 in English

Nahum 1:7 · Berean Standard Bible

The LORD is good, a stronghold in the day of distress; He cares for those who trust in Him.

Context

5Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya. 6Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya. 7Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi, 8ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya* niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị. 9Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.