Maika 7:12
Micah 7:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.
Micah 7:12 in English
Micah 7:12 · Berean Standard Bible
On that day they will come to you from Assyria and the cities of Egypt, even from Egypt to the Euphrates,* from sea to sea and mountain to mountain.
Context
10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ,
ihere ga-ekpuchi
onye ahụ sịrị m,
“Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.”
Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada,
ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ,
dịka apịtị dị nʼokporoụzọ. 11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa;
ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara. 12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị,
site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt,
sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis,
site nʼosimiri ruo osimiri,
sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu. 13Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya,
iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere. 14Were mkpanaka gị zụọ ndị gị,
bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị,
ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa,
nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara.
Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead,
dịka na mgbe ochie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.