Maika 7:14
Micah 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie.
Micah 7:14 in English
Micah 7:14 · Berean Standard Bible
Shepherd with Your staff Your people, the flock of Your inheritance. They live alone in a woodland, surrounded by pastures.* Let them graze in Bashan and Gilead, as in the days of old.
Context
12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị,
site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt,
sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis,
site nʼosimiri ruo osimiri,
sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu. 13Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya,
iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere. 14Were mkpanaka gị zụọ ndị gị,
bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị,
ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa,
nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara.
Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead,
dịka na mgbe ochie. 15“Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta,
aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.” 16Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha,
nʼime ịdị ike ha niile.
Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha,
ntị ga-echikwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.