Native Bible

Micah 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.

Micah 7:13 in English

Micah 7:13 · Berean Standard Bible

Then the earth will become desolate because of its inhabitants, as the fruit of their deeds.

Context

11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara. 12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu. 13Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere. 14Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie. 15“Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.