Native Bible

Micah 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.

Micah 7:11 in English

Micah 7:11 · Berean Standard Bible

The day for rebuilding your walls will come— the day for extending your boundary.

Context

9Nʼihi na m emehiela megide ya, aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m, mee ka m guzosie ike. Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè; aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya. 10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ. 11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara. 12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu. 13Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.