Maika 7:11
Micah 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.
Micah 7:11 in English
Micah 7:11 · Berean Standard Bible
The day for rebuilding your walls will come— the day for extending your boundary.
Context
9Nʼihi na m emehiela megide ya,
aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m,
mee ka m guzosie ike.
Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè;
aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya. 10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ,
ihere ga-ekpuchi
onye ahụ sịrị m,
“Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.”
Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada,
ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ,
dịka apịtị dị nʼokporoụzọ. 11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa;
ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara. 12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị,
site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt,
sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis,
site nʼosimiri ruo osimiri,
sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu. 13Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya,
iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.