Native Bible

Micah 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.

Micah 7:10 in English

Micah 7:10 · Berean Standard Bible

Then my enemy will see and will be covered with shame— she who said to me, “Where is the LORD your God?” My eyes will see her; at that time she will be trampled like mud in the streets.

Context

8Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m. 9Nʼihi na m emehiela megide ya, aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m, mee ka m guzosie ike. Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè; aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya. 10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ. 11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara. 12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.