Maika 7:10
Micah 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.
Micah 7:10 in English
Micah 7:10 · Berean Standard Bible
Then my enemy will see and will be covered with shame— she who said to me, “Where is the LORD your God?” My eyes will see her; at that time she will be trampled like mud in the streets.
Context
8Achịkwala m ọchị gị onye iro m.
Mgbe m dara, aga m ebilitekwa.
Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị,
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m. 9Nʼihi na m emehiela megide ya,
aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m,
mee ka m guzosie ike.
Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè;
aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya. 10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ,
ihere ga-ekpuchi
onye ahụ sịrị m,
“Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.”
Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada,
ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ,
dịka apịtị dị nʼokporoụzọ. 11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa;
ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara. 12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị,
site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt,
sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis,
site nʼosimiri ruo osimiri,
sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.