Maika 7:8
Micah 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m.
Micah 7:8 in English
Micah 7:8 · Berean Standard Bible
Do not gloat over me, my enemy! Though I have fallen, I will arise; though I sit in darkness, the LORD will be my light.
Context
6Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya.
Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya.
Nwunye nwa megidekwa nne di ya,
ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya. 7Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya.
Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m.
Chineke m ga-anụ olu m. 8Achịkwala m ọchị gị onye iro m.
Mgbe m dara, aga m ebilitekwa.
Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị,
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m. 9Nʼihi na m emehiela megide ya,
aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m,
mee ka m guzosie ike.
Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè;
aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya. 10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ,
ihere ga-ekpuchi
onye ahụ sịrị m,
“Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.”
Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada,
ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ,
dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.