Native Bible

Micah 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya. Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya. Nwunye nwa megidekwa nne di ya, ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya.

Micah 7:6 in English

Micah 7:6 · Berean Standard Bible

For a son dishonors his father, a daughter rises against her mother, and a daughter-in-law against her mother-in-law. A man’s enemies are the members of his own household.*

Context

4Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha. 5Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ. 6Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya. Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya. Nwunye nwa megidekwa nne di ya, ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya. 7Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya. Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m. 8Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.