Maika 7:4
Micah 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.
Micah 7:4 in English
Micah 7:4 · Berean Standard Bible
The best of them is like a brier; the most upright is sharper than a hedge of thorns. The day for your watchmen has come, the day of your visitation.* Now is the time of their confusion.
Context
2Ndị ezi omume agwụla nʼụwa,
ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ.
Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara,
ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya. 3Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume.
Onyeisi na-ana onyinye,
onye ọkaikpe na-eri ngarị,
ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha,
si otu a na-akpagbu eziokwu.* 4Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke.
Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu.
Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala,
ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị.
Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha. 5Ekwenyerela onye agbataobi gị,
atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi.
Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị,
ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ. 6Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya.
Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya.
Nwunye nwa megidekwa nne di ya,
ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.