Maika 7:2
Micah 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ezi omume agwụla nʼụwa, ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ. Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara, ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya.
Micah 7:2 in English
Micah 7:2 · Berean Standard Bible
The godly man has perished from the earth; there is no one upright among men. They all lie in wait for blood; they hunt one another with a net.
Context
1Ahụhụ dịrị m!
Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị,
mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị.
O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta,
o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike 2Ndị ezi omume agwụla nʼụwa,
ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ.
Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara,
ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya. 3Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume.
Onyeisi na-ana onyinye,
onye ọkaikpe na-eri ngarị,
ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha,
si otu a na-akpagbu eziokwu.* 4Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke.
Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu.
Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala,
ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị.
Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.