Maika 7:1
Micah 7:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịrị m! Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị, mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị. O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta, o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike
Micah 7:1 in English
Micah 7:1 · Berean Standard Bible
Woe is me! For I am like one gathering summer fruit at the gleaning of the vineyard; there is no cluster to eat, no early fig that I crave.
Context
1Ahụhụ dịrị m!
Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị,
mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị.
O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta,
o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike 2Ndị ezi omume agwụla nʼụwa,
ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ.
Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara,
ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya. 3Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume.
Onyeisi na-ana onyinye,
onye ọkaikpe na-eri ngarị,
ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha,
si otu a na-akpagbu eziokwu.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.