Maika 5:10
Micah 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.
Micah 5:10 in English
Micah 5:10 · Berean Standard Bible
“In that day,” declares the LORD, “I will remove your horses from among you and wreck your chariots.
Context
8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ
dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche,
e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ,
nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga,
ma o nweghị onye ga-anapụta ya. 9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya,
a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi. 10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu,
kụjisiekwa ụgbọala unu niile. 11Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi,
dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike. 12Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi,
unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.