Native Bible

Micah 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya.

Micah 5:8 in English

Micah 5:8 · Berean Standard Bible

Then the remnant of Jacob will be among the nations, in the midst of many peoples, like a lion among the beasts of the forest, like a young lion among flocks of sheep, which tramples and tears as it passes through, with no one to rescue them.

Context

6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị. 7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ. 8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche, e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ, nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga, ma o nweghị onye ga-anapụta ya. 9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi. 10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.