Maika 5:6
Micah 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa, jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd. Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ, mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị, ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.
Micah 5:6 in English
Micah 5:6 · Berean Standard Bible
And they will rule the land of Assyria with the sword, and the land of Nimrod with the blade drawn. So He will deliver us when Assyria invades our land and marches into our borders.
Context
4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya,
site nʼike nke Onyenwe anyị,
na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya.
Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu,
nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa. 5Ọ ga-abụkwa udo anyị.
Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike,
sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe,
anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa,
ọ bụladị ndịisi asatọ. 6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa,
jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd.
Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ,
mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị,
ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị. 7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ,
dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa,
maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa,
nke na-adịghị ele anya mmadụ
maọbụ chere ụmụ mmadụ. 8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ
dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche,
e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ,
nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga,
ma o nweghị onye ga-anapụta ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.