Maika 5:7
Micah 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ, dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa, maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa, nke na-adịghị ele anya mmadụ maọbụ chere ụmụ mmadụ.
Micah 5:7 in English
Micah 5:7 · Berean Standard Bible
Then the remnant of Jacob will be in the midst of many peoples like dew from the LORD, like showers on the grass, which do not wait for man or linger for mankind.
Context
5Ọ ga-abụkwa udo anyị.
Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike,
sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe,
anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa,
ọ bụladị ndịisi asatọ. 6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa,
jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd.
Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ,
mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị,
ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị. 7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ,
dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa,
maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa,
nke na-adịghị ele anya mmadụ
maọbụ chere ụmụ mmadụ. 8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ
dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche,
e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ,
nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga,
ma o nweghị onye ga-anapụta ya. 9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya,
a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.