Maika 5:9
Micah 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.
Micah 5:9 in English
Micah 5:9 · Berean Standard Bible
Your hand will be lifted over your foes, and all your enemies will be cut off.
Context
7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ,
dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa,
maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa,
nke na-adịghị ele anya mmadụ
maọbụ chere ụmụ mmadụ. 8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọb
ga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ
dị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche,
e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ,
nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga,
ma o nweghị onye ga-anapụta ya. 9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya,
a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi. 10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu,
kụjisiekwa ụgbọala unu niile. 11Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi,
dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.