Native Bible

Micah 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi, dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.

Micah 5:11 in English

Micah 5:11 · Berean Standard Bible

I will remove the cities of your land and tear down all your strongholds.

Context

9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya, a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi. 10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu, kụjisiekwa ụgbọala unu niile. 11Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi, dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike. 12Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi, unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase. 13Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi, ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu. Unu agakwaghị akpọ isiala nye ihe unu ji aka unu kpụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.