Abụ Akwa 5
Lamentations 5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;
leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị. 2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,
werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ. 3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.
Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ. 4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.
Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ. 5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,
ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike. 6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka
nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị. 7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.
Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha. 8Ndị bụ ohu na-achị anyị.
Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha. 9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,
nʼihi mma agha nke dị nʼọzara. 10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,*
na-amakwa jijiji nʼihi agụụ. 11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,
ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda. 12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;
a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ. 13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,
ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ. 14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,
ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha. 15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;
ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ. 16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.
Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela. 17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,
nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị. 18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,
nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị. 19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?
Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile? 21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;
gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie, 22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam
na-eweso anyị iwe nke ukwu.
5:10 Ite ọkụ a, bụ nke eji eghe ihe dịka achịcha maọbụ amịkpọ anụ na ihe ndị ọzọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.