Native Bible

Lamentations 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.

Lamentations 5:8 in English

Lamentations 5:8 · Berean Standard Bible

Slaves rule over us; there is no one to deliver us from their hands.

Context

6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị. 7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha. 8Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha. 9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara. 10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,* na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.