Native Bible

Lamentations 5:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.

Lamentations 5:15 in English

Lamentations 5:15 · Berean Standard Bible

Joy has left our hearts; our dancing has turned to mourning.

Context

13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ. 14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha. 15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ. 16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela. 17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.