Native Bible

Lamentations 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.

Lamentations 5:14 in English

Lamentations 5:14 · Berean Standard Bible

The elders have left the city gate; the young men have stopped their music.

Context

12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ. 13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ. 14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha. 15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ. 16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.