Abụ Akwa 5:20
Lamentations 5:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
Lamentations 5:20 in English
Lamentations 5:20 · Berean Standard Bible
Why have You forgotten us forever? Why have You forsaken us for so long?
Context
18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,
nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị. 19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?
Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile? 21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;
gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie, 22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam
na-eweso anyị iwe nke ukwu.
5:10 Ite ọkụ a, bụ nke eji eghe ihe dịka achịcha maọbụ amịkpọ anụ na ihe ndị ọzọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.