Native Bible

Lamentations 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.

Lamentations 3:13 in English

Lamentations 3:13 · Berean Standard Bible

He pierced my kidneys with His arrows.

Context

11o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka. 12Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata. 13O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi. 14Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile. 15O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.