Jona 2:3
Jonah 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.
Jonah 2:3 in English
Jonah 2:3 · Berean Standard Bible
For You cast me into the deep, into the heart of the seas, and the current swirled about me; all Your breakers and waves swept over me.
Context
1Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2Ọ sịrị,
“Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,
ọ zakwara m.
Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,
ị nụkwara olu akwa m. 3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,
nʼetiti oke osimiri.
Osimiri dịkwa m gburugburu,
ebili mmiri gị na mmali mmiri gị
gabigakwara m nʼisi. 4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị
chụpụ m;
ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ
nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ 5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,
ogbu mmiri na-erikpu m.
Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.