Jona 2:5
Jonah 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
Jonah 2:5 in English
Jonah 2:5 · Berean Standard Bible
The waters engulfed me to take my life; the watery depths closed around me; the seaweed wrapped around my head.
Context
3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,
nʼetiti oke osimiri.
Osimiri dịkwa m gburugburu,
ebili mmiri gị na mmali mmiri gị
gabigakwara m nʼisi. 4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị
chụpụ m;
ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ
nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ 5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,
ogbu mmiri na-erikpu m.
Achara mmiri kekụkwara m nʼisi. 6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,
ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.
Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,
Onyenwe anyị, bụ Chineke m. 7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,
e chetara m gị Onyenwe anyị,
ma ekpere m bịakwutere gị,
nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.