Native Bible

Jonah 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’

Jonah 2:4 in English

Jonah 2:4 · Berean Standard Bible

At this, I said, ‘I have been banished from Your sight; yet I will look once more toward Your holy temple.’

Context

2Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. 3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi. 4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ 5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi. 6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.