Jonah 2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2Ọ sịrị,
“Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,
ọ zakwara m.
Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,
ị nụkwara olu akwa m. 3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,
nʼetiti oke osimiri.
Osimiri dịkwa m gburugburu,
ebili mmiri gị na mmali mmiri gị
gabigakwara m nʼisi. 4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị
chụpụ m;
ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ
nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ 5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,
ogbu mmiri na-erikpu m.
Achara mmiri kekụkwara m nʼisi. 6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,
ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.
Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,
Onyenwe anyị, bụ Chineke m. 7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,
e chetara m gị Onyenwe anyị,
ma ekpere m bịakwutere gị,
nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ. 8“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,
na-agbakụta ebere Chineke azụ. 9Ma ọ bụ olu abụ ekele
ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.
Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.
Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ” 10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.