Jona 2:8
Jonah 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
Jonah 2:8 in English
Jonah 2:8 · Berean Standard Bible
Those who cling to worthless idols forsake His loving devotion.*
Context
6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,
ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.
Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,
Onyenwe anyị, bụ Chineke m. 7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,
e chetara m gị Onyenwe anyị,
ma ekpere m bịakwutere gị,
nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ. 8“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,
na-agbakụta ebere Chineke azụ. 9Ma ọ bụ olu abụ ekele
ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.
Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.
Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ” 10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.