Juel 3:10
Joel 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”
Joel 3:10 in English
Joel 3:10 · Berean Standard Bible
Beat your plowshares into swords and your pruning hooks into spears. Let the weak say, ‘I am strong!’
Context
8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile:
Jikerenụ agha!
Kpọteenụ ndị dike nʼagha.
Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha. 10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,
kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe.
Ka onye na-adịghị ike kwuo sị,
“Adị m ike!” 11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.
Zukọtaanụ nʼebe ahụ.
Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị! 12“Ka akpọlitekwa mba niile,
mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ
ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.