Native Bible

Joel 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.

Joel 3:9 in English

Joel 3:9 · Berean Standard Bible

Proclaim this among the nations: “Prepare for war; rouse the mighty men; let all the men of war advance and attack!

Context

7“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi. 8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha. 10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!” 11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.