Juel 3:8
Joel 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
Joel 3:8 in English
Joel 3:8 · Berean Standard Bible
I will sell your sons and daughters into the hands of the people of Judah, and they will sell them to the Sabeans—to a distant nation.” Indeed, the LORD has spoken.
Context
6Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha. 7“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi. 8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile:
Jikerenụ agha!
Kpọteenụ ndị dike nʼagha.
Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha. 10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,
kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe.
Ka onye na-adịghị ike kwuo sị,
“Adị m ike!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.