Juel 3:6
Joel 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
Joel 3:6 in English
Joel 3:6 · Berean Standard Bible
You sold the people of Judah and Jerusalem to the Greeks,* to send them far from their homeland.
Context
4“Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere. 5Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi* unu. 6Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha. 7“Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi. 8Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.