Juel 3:11
Joel 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!
Joel 3:11 in English
Joel 3:11 · Berean Standard Bible
Come quickly, all you surrounding nations, and gather yourselves. Bring down Your mighty ones, O LORD.
Context
9Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile:
Jikerenụ agha!
Kpọteenụ ndị dike nʼagha.
Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha. 10Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,
kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe.
Ka onye na-adịghị ike kwuo sị,
“Adị m ike!” 11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.
Zukọtaanụ nʼebe ahụ.
Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị! 12“Ka akpọlitekwa mba niile,
mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ
ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13Tinye mma iwe ihe ubi,
nʼihi na mkpụrụ ubi achaala.
Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị,
nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula,
ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke,
nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.