Juel 3:13
Joel 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
Joel 3:13 in English
Joel 3:13 · Berean Standard Bible
Swing the sickle, for the harvest is ripe.* Come, trample the grapes, for the winepress is full; the wine vats overflow because their wickedness is great.
Context
11Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.
Zukọtaanụ nʼebe ahụ.
Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị! 12“Ka akpọlitekwa mba niile,
mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ
ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13Tinye mma iwe ihe ubi,
nʼihi na mkpụrụ ubi achaala.
Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị,
nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula,
ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke,
nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” 14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!
Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. 15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,
kpakpando agakwaghị enye ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.