Juel 3:14
Joel 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
Joel 3:14 in English
Joel 3:14 · Berean Standard Bible
Multitudes, multitudes in the valley of decision! For the Day of the LORD is near in the valley of decision.
Context
12“Ka akpọlitekwa mba niile,
mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat,
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ
ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13Tinye mma iwe ihe ubi,
nʼihi na mkpụrụ ubi achaala.
Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị,
nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula,
ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke,
nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” 14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!
Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. 15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,
kpakpando agakwaghị enye ìhè. 16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn,
olu ya ga-ada nʼime Jerusalem.
Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.
Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba.
Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.