Juel 3:16
Joel 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
Joel 3:16 in English
Joel 3:16 · Berean Standard Bible
The LORD will roar from Zion and raise His voice from Jerusalem; heaven and earth will tremble. But the LORD will be a refuge for His people, a stronghold for the people of Israel.
Context
14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!
Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,
na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. 15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,
kpakpando agakwaghị enye ìhè. 16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn,
olu ya ga-ada nʼime Jerusalem.
Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.
Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba.
Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike. 17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu
bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ.
Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ.
Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,
mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;
mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.
Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta
dee Ndagwurugwu Shitim.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.