Juel 3:17
Joel 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
Joel 3:17 in English
Joel 3:17 · Berean Standard Bible
Then you will know that I am the LORD your God, who dwells in Zion, My holy mountain. Jerusalem will be holy, never again to be overrun by foreigners.
Context
15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,
kpakpando agakwaghị enye ìhè. 16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn,
olu ya ga-ada nʼime Jerusalem.
Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.
Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba.
Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike. 17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu
bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ.
Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ.
Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,
mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;
mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.
Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta
dee Ndagwurugwu Shitim. 19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,
Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda,
bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.