Juel 3:18
Joel 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
Joel 3:18 in English
Joel 3:18 · Berean Standard Bible
And in that day the mountains will drip with sweet wine, and the hills will flow with milk. All the streams of Judah will run with water, and a spring will flow from the house of the LORD to water the Valley of Acacias.*
Context
16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn,
olu ya ga-ada nʼime Jerusalem.
Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.
Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba.
Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike. 17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu
bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ.
Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ.
Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,
mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;
mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.
Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta
dee Ndagwurugwu Shitim. 19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,
Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda,
bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. 20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.
A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.