Juel 3:20
Joel 3:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
Joel 3:20 in English
Joel 3:20 · Berean Standard Bible
But Judah will be inhabited forever, and Jerusalem from generation to generation.
Context
18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,
mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile;
mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru.
Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta
dee Ndagwurugwu Shitim. 19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,
Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,
nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda,
bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. 20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.
A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile. 21Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha?
Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị.
Nʼihi na Onyenwe anyị bi na Zayọn.”
3:2 Ihe aha a pụtara bụ, onyenwe anyị na-ekpe ikpe
3:5 Maọbụ, ụlọ ukwu unu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.